歌詞
[Intro]
Obodo edelu
Obodo edelu jim jim
Obodo edelu
Obodo edelu jim jim
Obodo edelu
Obodo edelu jim jim
Ọyọlịma
[Chorus]
Anyanwụ ụtụtụ, biko bịa gbalụ egwu
Ahn, ahn, ahn, egwu m ejezugo, egwu ndị ọma
Ọpụlụiche nwaanyị, egwu apụta ọgbọ
Ahn, ahn, ahn, egwu m ejezugo, egwu ndị ọma
Mmiri doro edo, ka agbọghọ ji awụ arụ
Ahn, ahn, ahn, egwu m ejezugo, egwu ndị ọma
Electric nwaanyị, biko bịa gbalụ egwu
Ahn, ahn, ahn, egwu m ejezugo, egwu ndị ọma
[Verse 1]
Iyelele, anyị ekunie
Iyelele, anyị abata (Anyị abata n'ọgbọ)
Iyelele, ọ na-apkọtụ
Chai! Iyelele, fa na-enene
Aka na-eti ịgba, tibelụ m ịgba m o
Ọnụ na-egbu ọja, gbubelụ m ọja m o
Onye ụbọ akwala ee, ngwa kpọba ụbọ ka anyị jebenụ
[Chorus]
E mee enu, mee ana, ife Chukwu kwuru ga-eme
Ahn, ahn, ahn, egwu m ejezugo, egwu ndị ọma
Ugo nnwa m o, asa m gbaba egwu
Ahn, ahn, ahn, egwu m ejezugo, egwu ndị ọma
Mmiri doro edo, ka agbọghọ ji awụ arụ
Ahn, ahn, ahn, egwu m ejezugo, egwu ndị ọma
Ada dị iche m o, Ada mụ gbaba egwu
Ahn, ahn, ahn, egwu m ejezugo, egwu ndị ọma
[Verse 2]
Iyelele, ọ na-amụke
Iyelele, amụma mmiri
Iyelele, ọ na-afịọnụ
Iyelele, fa na-ekwunụ
Iyelele, ọ bụ m na-eme?
Iyelele, ọ kwa Chi mụ nyelụ m
Onye ya na Chi ya so, na-elu ebe ọ na-eje
Mana i bulu Chi yị ụzọ nụ, ị gbanarị enwe n'ọsọ
Ugo Chukwu melụ eze, ife ọ bụ bụ nkili
[Chorus]
E mee enu, mee ana, ife Chukwu kwuru ga-eme
Ahn, ahn, ahn, egwu m ejezugo, egwu ndị ọma
Akwaugo m o, bịa gbalụ egwu
Ahn, ahn, ahn, egwu m ejezugo, egwu ndị ọma
Ụdala nnwa, nnwa na ị malụ mma
Ahn, ahn, ahn, egwu m ejezugo, egwu ndị ọma
Ugo Chukwu melụ eze, na egwu anyị apụta ọgbọ
Ahn, ahn, ahn, egwu m ejezugo, egwu ndị ọma
[Bridge]
Ọyọlịma
Obodo edelu
Obodo edelu jim jim
Obodo edelu (Mix Monster)
Obodo edelu jim jim
Obodo edelu (Original Mr Flavour 'pon the dancefloor)
Obodo edelu jim jim (They don't know)
Written by: Chinedu Okoli, Udoka Chigozie Oku