album cover
Odogwu
72 058
Em digressão
World
Odogwu foi lançado em 12 de dezembro de 2018 por 2Nite Music Group como parte do álbum Awele - EP
album cover
Mais populares
Últimos 7 dias
01:40 - 01:45
Odogwu foi descoberto com mais frequência por volta de 1 minutos and 40 segundos após a Canção durante a semana passada
00:00
00:10
00:30
00:40
00:50
00:55
01:05
01:20
01:40
02:00
02:35
03:45
00:00
03:52

Letra

Obele echiche i chere gazielụ gị
I tibe aka n'obi, sị na ị bụ odogwu
I mee business, ọ baalụ gị
I tibe aka n'obi, sị na ị bụ ọkpọka
Politics gazielụ gị
I tibe aka n'obi, sị na ị bụ eshi
Kama ị ga-asị na Chi adịka
I tibe aka n'obi, sị na ị bụ mmanwụ
Ka m gwazianụ gị
I nesịa m anya, wee chee m aka mgba
Theophilus e kwuo gịnị?
Ikwunụ eziokwu na ọ bụnọọ ajọ ife
Onye ọma leyi, leyi, Papa
Ọ gbajiri igwe kpọọ ya nkụ o, daddy
Majesty oh
Ọ kwa Jehovah bụ odogwu
Ijele Africa nọ na-aba mba
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Afọ mụlụ eze na ọ na-aba
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Ndị Synagogue, fa ncha na-eti
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Ụmụ Adoration, fa na-aba
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Onye melụ onyeisi ọ fụkwa ụzọ ọzọ
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Onye mere ngwụrọ ọ gaba ije ọzọ
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Onye kwere nkwa, mezue nkwa
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Etina aka n'obi, sị na ị bụ odogwu
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Iyee, onye sị na Chi m adịị mma?
Gwanụ m oo
Onye sị na Chi m adịị mma lee?
Owelle Ajato
Ọ bụ gị sị na Chi m adịị mma lee?
Gwanụ m oo
Onye sị na Chi m adịị mma lee?
I woke up this morning, I see the light
I thank you, Lordy, for your mercy
Even though, I'm a sinner
That is not worthy of Your presence
Onye ọma leyi, leyi, Papa
Ọ gbajiri igwe kpọọ ya nkụ o, daddy
Majesty oh
Ọ kwa Jehovah bụ odogwu
Ijele Africa nọ na-aba mba
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Ziwaga chief na ọ na-aba
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Father Mbakaọgụ na o so aba
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Odogwu akataaka, odogwu bụ odogwu
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Omemma Ojoto nọ na-aba mba
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Agụ mụlụ ife, Money Mayweather
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Eribe agwụ agwụ nụ nọ na-aba mba
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
A na-alụ alụ, a na-ele ele
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Iyee, onye sị na Chi m adịị mma?
Gwanụ m oo
Onye sị na Chi m adịị mma lee?
Owelle Ajato
Ọ bụ gị sị na Chi m adịị mma lee?
Onye sị na Chi m adịị mma lee?
Onye eze Ben Alaukwu na-aba
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Eboh Communications Star, na-aba
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Asuwa Dede na ọ na-eti oo
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Baba Lotija, ezi ọyị m oo
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Obi Toscana, onu m ekenee oo
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Ogbodo nwa Aba, na o so aba
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Enugu Rangers, fa ncha na-eti
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Odogwu akataaka, odogwu bụ odogwu
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Ndị tili aka n'obi, kedị ka ọ dị fa oo?
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Pharoah Egypt, kedị ka ọ dị ya?
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Nebuchadnezzar, o mere olee?
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Etina aka n'obi sị na ị bụ odogwu
(Ọ kwa Jehovah bụ odogwu)
Written by: Flavour
instagramSharePathic_arrow_out􀆄 copy􀐅􀋲

Loading...