में प्रस्तुत

क्रेडिट्स

PERFORMING ARTISTS
Professor Onye Egwu
Professor Onye Egwu
Performer
COMPOSITION & LYRICS
Anekwe Johnpaul
Anekwe Johnpaul
Songwriter

गाने

[Verse 1]
Ọdụ ụzọ ife naabụ n'enu ụwa
Nke na enweghị etu anyị ga esi gbanahụ ya
Nke mbụ bụ ọnwụ
Nke ịbụọ bụ nka
Yellow sisi na-emelụ m fine girl
Mala amalụ, ịkaa nka, ịghọta ije
Gị bụ boy-yo-yo na-emelụ m fine boy
Mala amalụ, ịkaa nka, ịghọta ije
(Ịkaa nka eeh!)
Ewoo yo-yo-yo, ọkwa Professor, onye egwu
Ife m fụrụ ka m na ekwu
[Verse 2]
Ị fụrụ enu ụwa anyị nọ n'ime ya
Onye dị ndụ ga-akalịlị nka
Oji ego ga-akalịlị nka
Nwa ogbenye ga-akarịrị nka
Nwoke na nwaanyị ga-akarịrị nka
Ị bụ obere nwa ma ị bụ okenye
Ka ma na ife m na ayọzi bụ ka onye ọbụna sụrụ onwe ya akwụ na nso
Maka na ife m na afụzi bụ na ụfọdụ na asụ onwe fa akwụ na njọ
Fa wee chezọ na onye kaa nka, ọghọta ije
(Ịkaa nka eeh, ịghọta ije!)
[Verse 3]
Ụmụ ụwa gekwe mụ ntị na onu
Ọkwa ndụmọdụ ka m jiri bịa o, ụnụ nụrụ ya?
Ị fụrụ your youthful age, nwanne m, welụ ya mepụta ife maka ụbọchị nka
Ịliliwe ulu ife ịkpara akpa
Maka na nkụ onye kparụ na ọkọchị
Nya nwa ka ọ ga-anya na udu mmiri na ụbọchị nka
Ịkpata nkụ ahụhụ, ngwere ga-abịalụ gị ụgwọ
Ife imenwuro na youthful age ka m jụọ gị, ọ bụzi na nka?
Marụkwa na oyibo sụrụ wee sị that a fool at 40 is a fool forever, Ị nụrụ ya?
Ngwa welụ ya marụ na ịkaa nka, ịghọta ije
(Ịkaa nka eeh, ịghọta ije!)
[Verse 4]
Ị ya afụ nwata nwaanyị Chukwu kelu mma mma
Oje wee rụọ ike ya, ọkwa nke fa kpọrọ BBL
A na-ekwu na ọrụrụ ike ya, oje nụ rụnye ara (Artificial ara!)
A na-ekwu na ọrụ nyere ara, oje wee tewe ude ọcha
Nke fa kpọrọ organic skincare (Bleaching cream!)
Nya bụ na Chukwu kele ụwa kele gị na Omelụ mistake wee kee gị
Gị bụ nwata nwaanyị, mala amalụ, ịkaa nka, ịghọta ije
(Ịkaa nka eeh, ịghọta ije!)
[Verse 5]
Ị ya-afụ nwata nwoke Chukwu kelu mma mma
Oje wee tewe ude ọcha
A na-ekwu na ọ na ete ude, ọ na elecha na etecha
A na-ekwu na ọ na etecha
Oje wee rụọ ike ya
A na-ekwu na ọrụrụ ike ya o
Oje nụ rụnye ara
Mbụ nke fa kpọrọ transgender
Nya bụ na Chukwu kele ụwa kele gị na Omere mistake wee kee gị
Gị bụ nwata nwoke, mara amarụ, ịkaa nka, ịghọta ije
(Heee!)
[PreChorus]
Ị na-etegodu bleaching cream
Itelụ ma iteghụ, ịkaa nka, ịghọta ije
Imelụ BBL?
Imelụ ma imeghụ, ịkaa nka, ịghọta ije
Ịrụnyere ara?
Ịrụnye rụ ma ịrụnyeghụ, ịkaa nka, ịghọta ije
What of plastic surgery eeh wooh??
Imelụ ma imeghụ, ịkaa nka, ịghọta ije
What of onwere ego?
Inwelụ ma inweghị, ịkaa nka, ịghọta ije
What of ndị oke oriri?
Iriri ma irighụ, ịkaa nka, ịghọta ije
What of ọmarụ mma?
Ịmalụ ma ịmaghụ, ịkaa nka, ịghọta ije
What of ndị nṅụrụ ife?
Ịṅụrụ ma ịṅụghụ, ịkaa nka, ịghọta ije
[Chorus]
Iriri ma irighụ, ịkaa nka, ịghọta ije
Itelụ ma iteghụ, ịkaa nka, ịghọta ije
Imelụ ma imeghụ, ịkaa nka, ịghọta ije
Ịmarụ ma ịmaghụ, ịkaa nka, ịghọta ije
Ijelụ ma ijeghụ, ịkaa nka, ịghọta ije
Iriri ma irighu, ịkaa nka, ịghọta ije
Itelụ ma iteghụ, ịkaa nka, ịghọta ije
Imelụ ma imeghụ, ịkaa nka, ịghọta ije
Ịmarụ ma ịmaghụ, ịkaa nka, ịghọta ije
Ijelụ ma ijeghụ, ịkaa nka, ịghọta ije
Written by: Anekwe Johnpaul
instagramSharePathic_arrow_out