Video Musik

Video Musik

Dari

PERFORMING ARTISTS
Umu obiligbo
Umu obiligbo
Performer
COMPOSITION & LYRICS
Umu obiligbo
Umu obiligbo
Songwriter

Lirik

[Verse 1]
Na-eke nụ egwu ka m ji eje nụ
Ọkwa egwu ka-anyị ji ana nị eh?
Ive Chukwu kwulu nọọ nya ye emeri ee
Ọkwa egwu ka-anyị na-etili Chi m?
Amalise nya ka-anyị ji ejeri ee
[Chorus]
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
[Verse 2]
Ị ma na Ụmụ Obiligbo abịagokwenu?
Egwu anyị, ọ kwa nya ka-anyị ji eje ni ee?
Neenu na o lueni ka o si elu
Akụnwafọ, na ọọ kwa mụ na-ekwu ni ee
Ogbuọzọ nwanne m nọ n'ọgbọ
Ịgba nekwenụ icheku nụ
Ụmụ Obiligbo abịago ke ni
[Chorus]
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
[Verse 3]
Ị fụlụ Ụmụ Obiligbo apịaligo egwu?
Egwu anyị, ọkwa nya ka anyị ji eje nị ee
Ị ma mfe mfe na-efe na ife na-efelili?
Na nwaayọ nwaayọ ka-anyị ji etili egwu
Egwu amalịselele
Amalịse nya ka-anyị ji eje ri ee
Nekene egwu ka o si ararụ?
Ụmụ Obiligbo abịagokweni
Amalịse ya ka anyị na-etili Chi m
Ife onye ga-abụ ka nya ga-abụ nụ
Ife onye ga-abụ ka nya ga-abụ
Ị na-anụ ka mụ na-ekwu nụ ee?
Onye ya akpata ego
Iwu bụ na, nya bụ ego ya-abịalị ee
Nekenụ, na aka adịghị ekpuchi ọnwa
Ị na-anụ ka mụ na-ekwu?
Ụmụ Obiligbo abịago
Egwu anyị ọkwa ya ka-anyị na-etili Chi m?
Ife onye ga-abụ ka nya ga-abụ nụ
Onye bụ Chi ibe ya ni?
Asị m, onye ma ire echi ga-abụ nụ ee?
Ị malụ ife echi ga-abụ?
Ajụjụ ya ka mụ na-ajụ
Ị malụ ife echi ga-abụ nụ ee?
Egwu anyị ọkwa nya ka-anyị ji ejebuge
Ịgba nekwenụ Chi m ee
Ụmụ Obiligbo abịagokweni
[Chorus]
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
[Verse 4]
Mgbe anyị nọ nkịtị
Ndị mmadụ na-akọ ọnụ
Fa sị na anyị bụ ọsaaka
Na anyị abalọọ ulu chaa chaa
Mgbe anyị na-eto n'ogbe
Ndị mmadụ na-ekwu ajọ okwu
Fa wee chezọ, na men na-apịkọ
Mgbe anyị ji chakee
Ndị niine bụlụ ogili asụ
Wee jee golụ ogili lachaa
Ị fụgo ka ụwa si adị?
Onye ị na-akpọ onye ala
Nwele ike, apụta echi
Onye ala ama akpata ego
Ị na-afụ ka ụwa si adị?
Onye ị na-akpọ onye mgbu
Nwele ike apụta echi
Onye mgbu ama akpata ego
Mgbe avụ ịchọva iru ye
Onye ị kpọlọ ọsaaka
Nwelụ ike apụta echi
Ọsaaka ama akpata ego
Ngịnwa achọva iru ye
Ngwa gị na ya
Kedụzi onye bụ ọsaaka?
Ngwa gị na ya
Kedụzi onye bụ onye ala?
Ngwa gị na ya
Kedụzi onye bụ onye mgbu?
Ajụjụ nya ka mmụ na-ajụ nụ
Neenụ na o lue ka o si elu
Ife m fụlụ nya ka mmụ na-eti ni ee
Akọjọkwana mmadụ ibe gị
Maka na ọ nwelọọ aka ọlụ
Nee na echi dị ime
Onye manụ ife ọ ga-amụ ni ee
Emegbụna nwa boyị gị
Maka na ị malọọ ife echi ga-abụ
Ụwa na-eme ntụyalị
Ị na-anụ ka mmụ na-ekwu li ee?
Conductor kwusie okwu ike
Passenger akọba ya ọnụ
Ị na-akọ ya ọnụ?
Ị malụ ife echi ga-abụ?
Ajụjụ ya ka mmụ na-ajụ gị
Onye na-ama conductor
Ụwa kaalụ ya mma
Kalịa na ọ na-ezu ori
Ije ụwa esikekwa ike
Ị na-anụ ka egwu na-ekwu?
Akụnwafọ na ọọ mmụ na-ebeli ee
Onye kele mmadụ
Ọ kwa Gị nyelụ m akalaka m?
I wee sị mụ tivee egwu
M wee tivee egwu mụ
Chukwu Olisa onu m ekenee Gị
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
Asị m onye achụna ụwa n'ike
Onye emena ụwa n'ike
Achụna ụwa n'ike
Na nwaayọ nwaayọ, ka anyị ji ebilenu
Onye ọbụna nwelụ oge
Mgbe oge nke gị ye-elu
Ife dị mma ga-elu gị aka
Oziọma ya ka mmụ ji ejeli ee
Nekenu, ọkwa egwu ka anyị ji ejedebe
[Chorus]
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi mụ anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-alari ee?
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-alari ee?
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-alari ee?
Woiii!
[Verse 5]
Akụ na-etigbu ilo
Akụ na-etigbu okwu
Ọ kwa ego bụ nya na-achị?
Nwanne, ọ bụ na ị kpata ego
Ndị mmadụ abịava gị nso
Ndị ilo ya-agbalị gị ọsọ
Na anya ka mfa ya-enebezi
Akụnwafọ nọọ mụ na-ekwunuge
Ego dị mma na ikolobịa
Ego oyibo amaka
Ị na-anụkwa olu mụ?
Akụ na-etigbu ilo
Akụ na-esi obi ike
Ogbuọzọ nwanne mụ
Ị na-anụ ka-egwu na-arari ee?
Egwu anyị ọkwa nya ka-anyị na-etili Chi m
Nekenụ, ọ kwa egwu ka anyị ji ebili ee?
Amala welele ka anyị ji ejedebe
Ịgba nekweni Chi m oo
Ụmụ Obiligbo abịagokweni
[Chorus]
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
[Bridge]
Ice
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ oo
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ oo
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ oo
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ oo
Obodo ekwelugo na ịgba na ife ego na-eme
Ndị Eleke, njenụ eje iyee
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ oo
Obodo ekwelugo na ịgba na ife ego na-eme
Ndị Eleke, njenụ ee iyee
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ oo
Ife na-enye m aṅụli
Ife na-atọ m ụtọ iyee
Ife na-enye m aṅụli
Bụ na egwu m adịị ezu ezu chaa chaa
Ị na-anụ ka ude na-edenuge?
Ụmụ Obiligbo abago
N'ife balụ aba abago
Kpam kpam!
Ị na-anụ ka egwu na-ararige?
Egwu anyị ọkwa nya ka anyị ji eje
Ọọ nyanwa ka anyị ji eje n'ụwa m ooi
M sikwa Ụmụ Obiligbo abago
Ife balụ aba abago
Kpam kpam!
[Verse 6]
Ị na-anụ ka ude na-edenuge?
Egwu mụ na-eti bụ ọnatalụ Chi, ịgba
Egwu mụ na-eti na o si na Chukwu, ịgba
Ife Chukwu kwulu na ọọ nya ya-eme
Na nyanwa ka m ji eje n'ụwa mụ ooi
Fa sị na anyị ji ọgwụ eti egwu
Fa wee chezọọ
Egwu mụ na-eti bụ ọnatalụchi
Na nyanwa ka m ji eje n'ụwa m ooi
Eji ọgwụ eti egwu?
Ajụjụ nya ka mmụ na-ajụ
Ị sị na ọ bụ ọgwụ, jee gwọọ
Anya gị na ọ ga-afụ mmụọ
Na akalaka ka mụ ji eje
O si na Chi
Egwu mụ na-etili alachukwu
Egwu m na ọ bata n'ọgbọ ooi
Ụmụ Obiligbo abago
N'ife balụ aba abago
Kpam kpam!
Ị na-anụ ka uje na-ajegokwe?
Egwu mụ na-etili alachukwu
Na nyanwa ka m ji ebi n'ụwa m ooi
[Bridge]
Ice
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ oo
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ ooi
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ oo
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ ooi
Obodo ekwelugo na ịgba na ife ego na-eme
Ndị Eleke, njenụ ee iyee
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ ooi
Egwu anyi okwa ya ka anyi ji apa
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ ooi
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ ooi
Umu Obiligbo abago
Ife balụ aba abago
Kpam Kpam
[Verse 7]
Ị na-anụ ka egwu na-araruge?
Ị ma mfe mfe na-efe na ife na-efe ee?
Egwu anyị ọkwa nya ka anyi ji eje
Na yanwa ka m ji aga n'ụwa mụ ooi
Ife Chukwu kwuru nọọ nya ye-emeluge, ịgba?
Egwu anyị ọ kwa nya ka anyị na-etinuge, ịgba?
Ife a na-akọlọ ya ka ọ na-adị
Na nyanwa ka m na-ekwu n'ụwa mụ
Ụmụ Obiligbo na-etisi egwu ike
Akụnwafọ na ọọ kwa mmụ na-ekwu ee
Ogbuọzọ nwanne mụ nọ n'ọgbọ
Ị na-anụ ka egwu na-ararụ?
Ụmụ Obiligbo abịago
Egwu anyị ọ kwa ya ka anyi ji eje?
[Bridge]
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ oo
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ ooi
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ oo
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ ooi
Obodo ekwelugo na ịgba na ife ego na-eme
Ndị Eleke, njenụ ee iyee
N'Chi m ee, ee n'Chi m ee
Na o lue ka o si elu n'ụwa mụ ooi
Ụmụ Obiligbo abago
Ife balụ aba abgo
Kpam kpam!
[Verse 8]
Ị nụlụ ka ude yị ige na-ede?
Ude ige na-edeluge
Amala welele ka anyị ji edenuge
Ị ma mfe mfe na-efe na ife na-efe iyee
Ice
[Chorus]
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
Anya na-ene ụwa
Olisa anya na-ene ụwa
O Chi m anya na-ene ụwa
Ị na-anụ ka egwu na-arari ee?
Written by: Umu obiligbo
instagramSharePathic_arrow_out

Loading...