Credits

PERFORMING ARTISTS
Ayaka Ozubulu
Ayaka Ozubulu
Performer
COMPOSITION & LYRICS
Ayaka Ozubulu C
Ayaka Ozubulu C
Songwriter

Lyrics

Ụmụ Igbo, Chukwu ebuka
Igbo, Chukwu ebuka
Ụmụ Igbo, Chukwu ebuka
Yee moo, Chukwu ebuka o
(Igbo, Chukwu ebuka)
Ụmụ Igbo, Chukwu ebuka (Ụmụ Igbo, Chukwu ebuka)
O ji Chukwu ji ife (Igbo, Chukwu ebuka)
Onye bulu Chi ya ụzọ, ọ gbagbuo onwe ya n'ọsọ (Ụmụ Igbo, Chukwu ebuka)
Na mụ na Chi yị aga (Igbo, Chukwu ebuka)
Onye nzuzu na-achị na Chukwu anọrọọ
Onye nzuzu che na Chukwu n'ụla
Onye bulu Chi ya ụzọ, ọ gbagbuo onwe ya n'ọsọ
Aweda!
Onye beanyị, dị ịbọọ
Geenị mụ ntị, ka m kọọlụ unu akịkọ
E nwele nwatakịlị a na-akpọ Chukwuebuka
Chukwuebuka m na-akọlụ unu, jelụ obodo Oyibo
Nọọ ya bụ arọ ise, kele ụna, wee bulu ego wee ghanata
Obodo libe ife, maka Chukwuebuka
Onye ọbụna na-enwe aṅụlị
Ọlaobodo na-alacha aka, maka Chukwuebuka
Mana e nwee ndị amụ dị n'eze
Mana iwe dị ha n'obi
Ndị amụ dị n'eze
Mana obi na-enu fa inu
Enwelụ nwaanyị a na-akpọ Nwudimọma o
Nwudimọma bụ onye amoosu
Ndị beanyị ka a na-ajụ o
Onye amoosu, ọ na-adị mma agbataobi o?
Nwudimọma jelụ be Chukwuebuka
Chukwuebuka manye aka n'akpa o, welụ ego Oyibo
Wee nye Nwudimọma n'aka
Nwudimọma wee naba be ya
Nwudimọma nalue, Nwudimọma wee bawa mba
Ajụjụ ọ na-ajụ
"Kedụ ka ọ ga-esi bụ Chukwuebuka ga-enwe ego?"
"Na e mee enu, mee ana, na m ga-egbu Chukwuebuka o"
Ụmụ Igbo, Chukwu ebuka
Igbo, Chukwu ebuka
Ụmụ Igbo, Chukwu ebuka
Igbo Chukwu ebuka
Nwudimọma jelụ be dibịa
Ka nwadibịa gwọọlụ ya ọgwụ
Ka o gbuo Chukwuebuka
Nwadibịa chịlị aja pịa n'anị
Welụ aka bọọ kalatuna
Nwadibịa kpọlụ Nwudimọma o
"Naba be gị, na aka nnwa a dị ọcha o"
Nwudimọma abawa o
Nwudimọma wee bawa mba o
"Nwadibịa gwọọlụ m ọgwụ, ka m gbuo Chukwuebuka"
Ma mgbe nwadibịa na-agwọ ọgwụ, na o nwere ilu ọ tụụlụ ya
"Anaa elili udene eli, na udene bụ ajọ anụ"
Nwadibịa gwọsịa ọgwụ, wee bunye Nwudimọma, o bulu naa
Nwudimọma a naruo be ya
O wetala aka n'abanị ịtọ
Anya afụlọọ Chukwuebuka o
Nne mụlụ ọmụmụ tiba o
Mama Chukwuebuka, wee kwaba alịlị
Jebe n'ụnọ ụka, sekpuru ana, chinie aka ya enu
Akwa mama na-akwa, o
Aka ji nnwa m, raa nnwa m
(Aka ji nnwa m, raa nnwa m) Akwa mama na-akwa o
(Aka ji nnwa m, raa nnwa m) Aka ji nnwa m, raa nnwa m o
(Aka ji nnwa m, raa nnwa m) Ka nnwa jelụ ije, nata
(Aka ji nnwa m, raa nnwa m o)
Awele!
Olisa kelụ ụwa gba nkịtị, ọ dị ka Ọ nọ n'ụla
Chukwu Olisa gba nkịtị, ọ dị ka Ọ na-alalụ ụla o
Ma o tiri izu, ma o tiri onwa o
Obinigwe wee kwụlụ ọtọ, Chukwuebuka wee nata
Nwudimọma wee tiwe
O lote ilu dibịa tụụlụ ya o
"Anaa elili udene eli o, na udene bụ ajọ anụ"
Nwudimọma wee tiwe
(Udene bụ ajọ anụ
Anaa elili udene eli
Afọ lili udene, ga-agbọ ya agbọ n'ike)
Wee, wee wee mụ o (Udene bụ ajọ anụ)
Anaa elili udene (Anaa elili udene eli)
Afọ lili udene, ga-agbọ ya agbọ
(Afọ lili udene, ga-agbọ ya agbọ n'ike)
Iyo m, iyoko o (Udene bụ ajọ anụ)
Anaa elili udene (Anaa elili udene eli)
(Afọ lili udene, ga-agbọ ya agbọ n'ike)
Ihe nọ n'ije na-enu ụwa o, wụ ije enu o
Ije enu ụwa bụ ọlịlị
Onye metelụ, o bunyelụ Chi nye
Onye na-achọ onye aka ya dị ọcha, ya ka m na-ajụ
"Ị ga-eli udene eli?"
Onye na-achụ udene ka i jide
Ajụjụ m na-ajụ o
"Ị ga-eli udene eli?"
"Ị ga-esi udene esi?"
"Ị ga-arụ udene n'ọkụ o?"
Onye na-achọ onye aka ya dị ọcha o
I lozọ na Chukwu nọ n'igwe
Maka ị bịa n'ụwa bụ ọlịlị
Onye melụ ike ya, ọ naa
(Udene bụ ajọ anụ
Anaa elili udene eli
Afọ lili udene, ga-agbọ ya agbọ n'ike)
(Udene bụ ajọ anụ
Anaa elili udene eli
Afọ lili udene, ga-agbọ ya agbọ n'ike)
Written by: Ayaka Ozubulu C
instagramSharePathic_arrow_out

Loading...