Credits
PERFORMING ARTISTS
Umu obiligbo
Performer
COMPOSITION & LYRICS
Obiligbo Ebuka
Songwriter
PRODUCTION & ENGINEERING
Aku wealth
Producer
Lyrics
[Verse 1]
Ụka akpalụ akpa, ọkwa isi ka-eji ekwe ya?
Asị m, "Ụka akpalụ akpa, ọkwa isi ka-eji ekwe ya?"
Akpagbuwe mma, chai, alalụ n'ute
Ọkwa akpa ya akpa nwanne, alalụ n'ute?
Ije love na-adị gị mma
Love na-egbu gị ka mmanya, imegide nụọ onye dị njọ
Mmanya afụ efo gị n'anya
Anụm di na nwunye esigo ike
Ṅakwaa nti, "Anụm di na nwunye esike ike"
Nwanne, a na-elu ya elu
M si na, "Anụm di na nwunye esike ike"
Chai, a na-elu ya elu, iye, iye, iyaah
[Verse 2]
Ọbụrọọkwa ịnụ nwaanyị bụ isi
Ị lụlụ ife eji ebi e
Gekwaa nti
Ị ga-enwe ọlụ, Ị ga-enwe uche
Ị ga-edikwa ife
Ejina na love atogbuo gị banye marriage
A na-elukwa ya elu, brother, iyeee
Ụka akpalụ akpa, ọkwa isi ka eji ekwe ya
Ọbụrọkwa ọnaa gị ego, ịkọbalụ nna gị
Ọbụrọkwa ọyọọ gị ego, ịkpeseba nne gị
Ọbụrọkwa unu nwe obele okwu ịkpesaba ọyị gị
Ị na-anụ ife mụ na-ekwu e, brother? Iyee
[Verse 3]
Anything wey go take my peace of mind, I don't want
Even if na person wey I love, I don't care
Even if na person wey I marry, I don't care
Ọbụrụgodụ ma money nke ga-eju m alụ, jide, eyie
Oyị m nwoke a na-akpọ Igwe
Ọkwa ọfụjulu anya, sị n'ije love esika
[Refrain]
Igwee igwe
Igwee Igwee (Igwee Igwee)
Igwee Igwee (Igwee Igwee)
[Verse 4]
Anụm di na nwunye esike ike
Ewuu, A na-elu ya elu
Mana, akpa ya akpa, alalụ n'ute
Ịnụta nwunye gị, ọ ga-elikwa nni
Ọ ga-eme isi, ọ ga-eyi akwa
Ọ gaedozi onwe ya dịka ụmụ nwaanyị na-adị
Ị na-anụ ife mụ na-ekwu e, brother? Iyee
Nwoke, fụ na ị na-enwete ego
Nwaanyị fụ na ị na-alụkwa ọlụ
Wee jebe marriage, ụmụazị ga-elikwa nli
Ụmụazị ga-agụ akwụkwọ, iye iye, iyaa
Okwu m gwalụ di na nwunye, "Rapụ social media"
Onye ị na-enejelụ anya, ọgwa gị nke ọ na-afụ
Isekpulu ana kene Chi gị, ị na-anụ? iyee
[Outro]
Ịma na Ụmụ Obiligbo abịagokwebu, brother eeh?
Chai, Ụmụ Obiligbo nno oo
Iye, iye iye iye iyaa
Iye, iye iye iye iyaa
Eee, iyeeee
Written by: Obiligbo Ebuka

