制作
出演艺人
S-Model
表演者
作曲和作词
Chukwunonso Okafor
词曲作者
歌词
[Verse 1]
Ee, iyokonụ o
Chi m kpọlụ oku o, Ọza m ekpele
Chi m kpọlụ oku azago m ekpelenụ
Ihe ọma m bu na obi o na-emelụ mụ o
Ọdịka m jelụ be Chukwu
Chi m kpọlụ oku ee-ee
Iyokonụ o, iye
Omegokwe ka osi emenụ o, iyokonụ e
Alịlị egbue ndị ilonụ
Omegokwe ka osi emenụ e, Chukwu eyi
Alịlị egbue ndị ilonụ
Ọbụlụ uche mmadụ o, na-emenụ ee
Ndị mmadụ ga-eme mụ ncha nụ
Chi m kpọlụ oku ee
Chi m kpọlụ oku o, za m ekpelenụ
Ọbụlụ uche mmadụ o, na-emenụ ee
Ndị mmadụ ga-eme mụ ncha nụ
Ma mkpụlụ osisi awụsalụ na enu ananụ oo
Ịma na omesịlị puo one
Oye lụlụ ụka ya-afụnanya nụ
Ọkụkọ nyụọ alụ anyị achụọ ya ọsọnụ
Ọbụlụ onye asị nwụọ na anwụnụ oo
Maka na onye gbulu opi ga-efịcha ọnụ
Mm, alịlị egbụe ndị ilo
Nke m akọnamọ oo, Chukwu ee
Onye nwele ego na-eme ife sọlọ yanụ
Onye na-eme ka m si emenụ o
Ọkwa Gi ka egwu m na akpọnụ o
Oyị mụ bịa nụlụ egwumụ o
Egwu mụ bụ ojemba enwe ilonụ
Egbue dike na ụnọnụ o
Ife dike meenụ achọba nwa dikenụ
Oke osisi daanụ oo
Oke osisi daanụ, ụmụ nnụnụ awalụ ọsọnụ
Onye si na ụnọ egbu nwanne ya
Igbuo nwanne gị, gị na onye ga-ebi?
Ife Chukwu kwulu nya ga-emenụ oo
Ndị na-esi ngọnụ na-esi na nkịtị
Onye Cukwu mele eze ga-abụzị eze
Omelọ na izu, omenụ na ọnwa
Chi m kpọlụ oku ee Ọza m ekpele
Chi m kpọlụ oku azago m ekpele
Ife anya mụ na-afụ ee
Ife anya my na-afụ, nya ka ọnụ na-ekwu
Chi m mkpọlụ oku ee, Ọza m ekpele
Chi m kpọlụ oku azago m ekpelenụ
[Outro]
Lifestyle
Extraordinire
Written by: Chukwunonso Okafor

