旋律
歌曲有多麼清晰易記且符合明確音樂模式的旋律。通常,旋律分明的作品會擁有清晰易記的器樂或人聲主線。
原聲音質
此指標衡量一首歌曲在多大程度上依賴原聲樂器 (例如鋼琴、吉他、小提琴、鼓、薩克斯風),而非電子或數位合成音效
Valence
歌曲透過和聲與節奏所傳達的音樂積極性或情感基調。數值高通常對應快樂、興奮或愉悅感,數值低則與悲傷、憤怒或憂鬱相關。
節奏感
綜合了節拍穩定性、節奏型態與重拍強度等多重因素,以判定一首歌曲適合跳舞的程度。一首「節奏感強」的歌曲,通常具備穩定的速度、重複的音樂結構與明顯的強拍。
輕快
曲目的律動感可能受節奏快慢、音量起伏與聲譜密度所影響。較輕快的歌曲通常節奏強勁,編曲豐滿;反之,不太輕快的歌曲則可能編曲簡約、節奏較慢。
BPM133
歌詞
[Intro]
Anụ melụ ọgọ, anụ melụ ọgọ, ebulu ọgọ baa ọfịa
[Verse 1]
Olisa, nwa Mbaka dibenụ, Olisa nwa Mbakaa
Olisa, nwa Mbaka dibenụ, Olisa nwa Mbakaa
Akụkata akụdebe, ọkwa nya na-enweta depression?
Erikata eridebe, ọkwa nya na-enweta depression?
Ọrụ na-eli eli, ọdịrọ mma ibuọnụ ma ncha
Chukwu ekwena ka-ọkọ m, Chukwu ekwena ka-ọkọ ọyị m
Ụmụ Obiligbo nno oo ((Ayaya oo))
Ọkwa ụkwụ jili agụ, ụmụ mgbada abịa ya ụgwọ?
Ọkwa ụkwụ jili agụ, ụmụ mgbada abịa ya ụgwọ?
Ọkọ nwoke na aka, onye ọbụna egosi onwe ya
Ịmalụ ndị fụlụ gị n'anya, malụ ndị ji aghụghọ abịa ee
Akụkata akụdebe, ọkwa nya na-enwete frustration?
Elikata elidebe, ọkwa nya na-enwete depression
[Chorus]
The downfall of man is not the end of his life
The downfall of man is not the end of his life ee
Iyo iyo, ụwa bụ nke onye?
(Ayaya oo)
Akụnwatụ na-ajụ, ụwa bụ nke onye?
(Ayaya oo)
Athur Eze nwanne mụ, ụwa bụ nke onye?
(Ayaya oo)
Smach beanyịnụ, ụwa bụ nke onye?
(Ayaya oo)
Bright nwanne, ụwa bụ nke onye?
(Ayaya oo)
Jaystunt nwanne mụ, ụwa bụ nke onye, oga?
(Ayaya oo)
Ụwa bụ nke onye?
(Ayaya oo)
[Verse 2]
Imakwa Olisa, nwa Mbaka, zụlụ enyi ya nwaanyị na akwụkwọ
Mgbe Olisa na-eme ọfụma, mgbe ọka na-azụsị afịa ya ike
Her second year, Olisa bido wee nwebe nsogbu
Egwulu ya wayo, nalụ ya ego oji azụ afịa n'Otu, ife mgbu wee bido
Mgbe ifea na-eme, enyi ya nwaanyị nọ n'ụnọ akwụkwọ
Eruo her final year, ofu nwoke si obodo oyibo nata
Kpọpuo ntị ya, se sịa tattoo n'arụ niine
Etu ife ụwa si adị, ọbụlụ asa nwa Mbaka
Ka the guy fụlụ n'ezi wee gwakaa asa nwa Mbaka, gwakwuo ya na ọ ga-anụya anụ
Ife melụ mbọsi Monday, apụta mbọsi Wednesday
The girl kpọọ nwa Mbaka
Olisa nwa Mbaka, ọkwa ịma na ịgụlọọ akwụkwọ?
Nwa Mbaka, ilibulu ego iji afịa?
Ife m na-eme, ka m gwa gị
Obele oge, m ga-anụkwa di, di obodo oyibo
Olisa nwa Mbaka wee tie, welụ ọsọ wee gbakwute mụ, ka ọ malụ ife m ga-agwa ya
Ife m gwakwanụ nwa Mbaka, "Onye egbulu esuo be ya ọkụ"
Nwa Mbaka, "Onye egbulu esuo be ya ọkụ"
Ajụjụ m na-ajụ ụmụ ụwa, ọbụlụ gị bụ nwa Mbaka, kedụ ife ị ga-eme?
Ajụjụ m jụlụ, onye ga-aza?
Ajụjụ m jụlụ, onye ga-aza?
[Chorus]
The downfall of man is not the end of his life
The downfall of man is not the end of his life ee
Iyo iyo, ụwa bụ nke onye?
(Ayaya oo)
Akụ white na-ajụnụ, ụwa bụ nke onye?
(Ayaya oo)
Athur Eze nwanne mụ, ụwa bụ nke onye?
(Ayaya oo)
Smach beanyịnụ, ụwa bụ nke onye?
(Ayaya oo)
Bright nwanne, ụwa bụ nke onye?
(Ayaya oo)
Jaystunt nwanne mụ, ụwa bụ nke onye, oga?
(Ayaya oo)
Ụwa bụ nke onye?
(Ayaya oo)
Written by: Obiligbo Ebuka


