Lyrics

Ijenu ụwa munachi so eje Obodo ekwelugo nu na munachi so eje N' akalaka bụ ya n' edu oo eyeeee Unu afụgo kwenu ude na-ude ya gi Ka m kwube kwe nụ ya ọzọ ooo Eyi na-ife ego na-eme Ịyo ịyo okooko ko Amalu ise lele Ịyo ịyo okooko ko Amala helele (iyoyo okooko ko) Iyo okooko, iyo okookooko (iyoyo okooko kọọ) Amala ise ya ka anyị ji ejebekwe, ngwa Ụmụ Obiligbo abiagokwe nyi, Amalu ise lele Akunwafor nọkwa mmu nekwu, M na Okpuọzọr nwanne m Egwu anyị nya ka anyị ji eje Ka m kwube kwanu ya ọzọ oooo Eyio nịyo okooko ko Egwu anyị ọkwa ya ka anyị ji ana Ọkwa egwu ka anyị ji eje iyee oo Amalu selele Munachi so ejenu, Amala welele Ka m kwube kwanu ya ọzọ ooo Eyio niyo okooko ko Akunwafor (aha aaaaa) Ya na Okpuọzọr (aha aaaaa) Udo ka anyị na-achọ, Udo a, udo ka anyị na-achọ Ịgba meeee (aha aaaaa) Ife dị mma bụ Udo, Udo ahụ ya ka anyị na-achọ. Ka m kwube kwanu ya ọzọ ooo Eyi na-ife ego na-eme Iyoyo okooko ko eyeeee eh. Amala selele (iyoyo okooko koo) (Iyoyo okooko ko) Olisa Chukwu, ọnụ m ekelee gi Obinigwe ọnụ m ekelee Ife I kwụrụ ka m na-eme Udo ka m na-ekwu(obodo kelee nụ m chi mee) Ife dị nma bụ udo Udo ahụ ya ka anyị na-achọ Ịgba munachi so eje iyee eh (obodo nekwanu chi mee) Amala selele Ịgba munachi so eje niyo oko, Niyo okooko ko oko (obodo nekwanu chi mee) Onye ọ bụla chọrọ udo (ịgba nekwanu chi mee) Asị m, onye ọ bụla chọrọ udo Ebe udo na-alụ ọlụ, ebe afụ ka ife dị nma na-abịa Ị naa nu ka m na-ekwuoyi Amalu iselele Olisa Chi mee, bịa wetekene nụ udo na-ezinụlọ niile Ayiyo ya ka m na ayiọ Ị naa nụ ka m na-ebele enu Ị nelu anya, ọbụna Nne gị na Nna gi Na fanabu bụ ịlo ọnwe fa Ọ na-emetụta ụmụ aka Ọ na-egbochi kwa ụzọ Ị naa nụ ka- egwu na-ekwu Ezinụlọ na-enwelu udo, na ife dị nma na-agbalu fa ọsọ Dị na Nwunye sebe okwu Ọganilu na-agbalu fa ọsọ Ụmụ fa mụrụ agbasasịa Nsị, ụmụ fa mụrụ agbasasịa Obodo na-enwelu udo, ọganilu na-agbalu fa ọsọ Ọkwa fa achili egbe n'aka. Ife m fulu ka m na-ekwu okwu ya. Nke kasị njọ n'ụwa a bụ na di na nwunye sebe okwu Di na Nwunye sebe okwu, ife izizi ọga eme fa Abia Nne akpọkọlu ụmụ ya si fa na papa fa na-egbu fa egbu Na ọ na- ata amuosu ọkwa ka fa gbabara Nna fa ọsọ Nne akpọkọlu ụmụ ya Nwoke nwe ụnọ ana- ebe akwa eyi Oké echiche ezue nya alụ Nya bụ na Nwoke na- anwụ n'ọge Ewuu mee Ewụ Chukwu akwa alili nya Ka m na-ebenu nu eyi niyo okookoo ko Ị naa nụ ka egwu na-ara nụ eeeee Amalu iselele Ịgba mee (aha aaaa) Ife dị nma bụ udo, udo ahụ nya ka anyị na-achọ Ị naa nu ka egwu na-ara iyoo Amala selele Nwoke chụsia ego ka ọ nata ọke echiche ezue ya alụ Ọbịazia ọ tinye uche na mmanya Ọnwụ Sia ya ogbu biye egbu ka ọ wee chefunata Ife ọ na afụ na ụnọ ya Ifulu ndị amụma ụgha fa na-ekposa si ụnọ ofuma A bịa obubelu gị amụma si na papa gị na-egbu gị egbu A bịa obubelu gị amụma sị na Nne gị na-achọ gị ọnwụ Mmadụ a ga-amụ sị nwa chọba kwa ka ogbue ya egbu Ajụjụ ka m na-ajụ Ajụjụ m jụrụ onye ga za m eeee e Amalu selele Nelue ọnwe gị anya makwalu ife ị na-eme Ọ me nma na nma yi an Ọ me njọ na-egbu ọnwe ya Ị naa nụ ka m na-ekwu Ozi Ọma ka m ji eje Ndị amụma ụgha unu na-achọ kwa Chukwu okwu eyi ịgba mee Iko iji malu mmadụ ibe gi Ọkwa ya ka aga eji kwa Wee maajuelu gị ụkpa Ị naa nụ ka egwu na-ara Makwalu ife ịna-eme Olisa Chi me bịa chebe kwelu m Nne m Olisa Chi keru m bịa chebe kele m Nna m Nne na-eme kwa nwa ma Nna ji isi aghọ mgbọ Nna na-edozi obi, Ndị ilo na-asọ Nna anya Ị naa nụ ka m na-ekwu Akunwafor nọ m na-ekwu ka m kwube Kwanu ya ọzọ ooo eyio niyo okookoo ko Iyoyo okookoo ko Eyio na ife ego na-eme Ịyoyo okookoo ko ịyo ooo Amalu selele Ịyoyo okookoo ko Asị na papa m anulọ Nne m Ọ dị ọnye ga- amụta Akunwafor n' ụwa Ya na Okpuọzọr iyoyo okookoo ko eyieee Ụfọdụ na-eti Npa fa ife Maka na ọkago nka Ọ zikwa onye Kalu nkà ọdịka ọnwụlọ ala Nne e Ị naa nụ kwa onu m Nwoke ga-afu ife ibe e na-afu Ị Kaya amụta nwa and ị Kaya kakwu nka I kasịa nkà mgbe afụ nwa gị tiee gị Ka ịfụ ka ụwa sị adị Ngwá nelue onwe gị anya ọbụlụ na ị Na-eti Npa gị ife yio kwa nya ka ọgba gharu gi Ị naa nụ ka m na-ekwu M wee tiie okokokokoooyio Amalu selele Ịyoyo okookoo ko M wee tiie okokokooo (iyoyo okookoo ko) Akunwafor niyo okokokooo(iyoyo okooko ko) Ịgba n' ife ego na-eme Ịyoyoy okokokooo Akunwafor tiee okokokooo (iyoyo okooko kọọ) Okpuọzọr tiee okookooko (iyoyo okooko koo) Ịyoyo okooko (till fade) End
Writer(s): Ifeanyi Obiligbo, Ebuka Obiligbo Lyrics powered by www.musixmatch.com
instagramSharePathic_arrow_out