Vídeo de música

Destacado em

Créditos

COMPOSITION & LYRICS
Peter E Dimgba
Peter E Dimgba
Songwriter

Letra

Ị nwere ihe karịrị Chineke, biko ribe ya enyelam Asị onye buru Chi ya ụzọ ọgbagbuokwa onwe ya n'ọsọ na elu uwa Nwanne cherekwe, Chukwu kere gi ya kere igwe na ala Obugi onye buru ụzọ gbaba ọsọ na-agbata ihe a na agba n'ọsọ Ka anyị ñaa ya ntị Ọ bụ oji ji jide mma Ka Anyị ñaa ya ntị Mmalite n'ọgwugwu bụ aha ya Ka anyị ñaa ya ntị Ọ mazuru ihe n'iile Asị onye buru Chi ya ụzọ ọgbagbuokwa onwe ya n'ọsọ Dika anyị na-achụ ego ụwa ka anyị kwuba aka anyị ọtọ Hapụ oke ọchụchọ, ogechi ka ya nma Ijiji ikenti na esoro ozu we lawazie Asị onye buru Chi ya ụzọ ọgbagbuokwa onwe ya n'ọsọ Ị nwere ihe karịrị Chineke, biko ribe ya enyelam Asị onye buru Chi ya ụzọ ọgbagbuokwa onwe ya na ọsọ n'elu ụwa Nwanne cherekwe, Chukwu kere gi ya kere igwe na ala Ọ bughị onye buru ụzọ gbaba ọsọ na-agbata ihe a na agba n'ọsọ Ka anyị ñaa ya ntị Ọ bụ oji ji jide mma Ka Anyị ñaa ya ntị Mmalite n'ọgwụgwụ bụ aha ya Ka anyị ñaa ya ntị Ọ mazuru ihe n'iile Asị onye buru Chi ya ụzọ ọgbagbuokwa onwe ya n'ọsọ Ọnwụnwa bia n'ụzọ mụ Ọ bụkwa ya Kam ga akọsara Ndi enyi haripu mụ Ọ bụkwa ya Kam ga akọsara Ịkwu na ibe kpọm asị Ọ bụkwa ya Kam ga akọsara Asị onye buru Chi ya ụzọ ọgbagbuokwa onwe ya n'ọsọ
Writer(s): Peter Dimgba Lyrics powered by www.musixmatch.com
instagramSharePathic_arrow_out